Jeremiah 39:16 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Je, gwa Ebed-melek, bú onye Etiopia, okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje ime ka okwum nile biarue obodo a ime ya ihe ọjọ, ọ bughi ime ya ezi ihe; ha gādi kwa n'iru gi n'ubọchi ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Jekwuru Ebed-Melek onye Kush, gwa ya sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Lee, ana m aga ime ka okwu ahụ m kwuru megide obodo a mezuo. Ihe ga-abịakwasị obodo a bụ ịla nʼiyi, ọ bụghị ọganihu. Nʼoge ahụ, ihe ndị a ga-emezukwa nʼihu gị.