Jeremiah 39:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
na ndi-isi nile nke eze Babilon batara, we nọdu n'ọnu-uzọ-ama nke etiti, bú Neagal-shareza, na Samga-nebo, na Sasekim, bú Rab-saris, na Neagal-shareza, bú Rab-mag, na ndi-isi nile nke eze Babilon fọduru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ndịisi niile nke eze Babilọn batara were ọnọdụ ha nʼọnụ ụzọ ama nke Etiti. Ndị a bụ ndị batara: Negal-Shareza onye Samga, na Nebo-Sasekim, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza onyeisi nke ọkwa ya dị elu, na ndịisi niile ọzọ nke eze Babilọn ndị fọdụrụ.