Jeremiah 39:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O rue, mb͕e Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-agha nile huru ha, na ha b͕alagara, were abali si n'obodo ahu pua, n'uzọ ubi eze ab͕ara ogige, n'ọnu-uzọ-ama nke di n'etiti mb͕idi abua: o we pua ga n'uzọ Araba.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Zedekaya eze Juda na ndị agha ya niile hụrụ ha, ha gbapụrụ ọsọ. Ha ji abalị gbapụ nʼobodo ahụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, chee ihu nʼụzọ Araba.