Jeremiah 4:7 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọdum esiwo n'alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n'ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta, ka onye a na-ebibi mba niile si abịa. Ọ hapụla ebe obibi ya, na-abịa ịla Juda nʼiyi. Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda, ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha.