Jeremiah 40:1 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, zilagasiri ya site na Rema, ka o weresiri ya mb͕e ọ bu onye ejiri nkpọrọ ke ab͕u n'etiti ndi Jerusalem na Juda nile ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi emere ka ha je biri na Babilon.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe oge nta gasịrị site nʼoge Nebuzaradan ọchịagha ndị nche nọ na Rema mere ka Jeremaya nwere onwe ya, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị. Nebuzaradan hụrụ Jeremaya mgbe e kekọtara ya na ndị e si na Jerusalem na Juda dọta nʼagha agbụ, bụ ndị ahụ a na-ebula Babilọn.