Jeremiah 41:10 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ishmael we dọta ndi Israel nile fọduru ndi nọ na Mizpa n'agha, bú umu-ndinyom eze, na ndi Israel nile fọduru na Mizpa, ndi Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta-ha: Ishmael nwa Netanaia we dọta ha n'agha, je igabigakuru umu Amon.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ishmel dọtakwara ndị niile fọdụrụ nʼime Mizpa nʼagha. Ọ dọtara ụmụ ndị inyom eze nʼagha, dọtakwa ndị ahụ niile a hapụrụ nʼebe ahụ, bụ ndị ahụ Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze mere ka Gedaliya nwa Ahikam bụrụ onye na-achị ha. Ishmel nwa Netanaya dọtara ha niile nʼagha duru ha na-achọ ịgbapụ gaa nʼala ndị Amọn.