Jeremiah 41:9 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma olùlù ahu ebe Ishmael tubàra ozu nile nke ndikom ahu ndi o tib͕uru, n'akuku Gedalaia, (olùlù ahu bú nke Esa, bú eze, mereri n'ihi Beasha, bu eze Israel,) olùlù ahu ka Ishmael nwa Netanaia were ndi eb͕uru eb͕u tujue.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Olulu ahụ Ishmel tụnyere ozu Gedaliya na ozu ndị ọzọ ahụ niile bụ olulu nke Asa bụ eze gwuru maka ichebe Jerusalem mgbe Baasha eze Izrel na-ebuso ya agha. Ọ bụkwa ozu ndị mmadụ ka Ishmel, nwa Netanaya kpojuru nʼime olulu ahụ.