Jeremiah 42:16 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
ọ gēru kwa, na mma-agha ahu nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n'ebe ahu ka ọ gēru unu aru n'ala Ijipt; ọzọ, oké unwu ahu, nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n'ebe ahu ka ọ gārapara unu n'aru n'iso unu n'azu n'Ijipt; ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gānwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
mgbe ahụ, mma agha ahụ unu na-atụ egwu ga-eru unu nʼahụ, ụnwụ ahụ unu na-atụ oke egwu ya ga-esoro unu baa nʼIjipt. Unu ga-anwụkwa nʼebe ahụ.