Jeremiah 43:2 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Azaraia nwa Hoshaia, na Johanan nwa Karea, na ndi-nganga nile, we kwue, si Jeremaia, Okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu: Jehova, bú Chineke-ayi, eziteghi gi isi, Unu abàla n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Azaraya nwa Hoshaya, Johanan nwa Kariya na ndị nganga niile nọ nʼebe ahụ, gwara Jeremaya okwu sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka i kwuru! Onyenwe anyị Chineke anyị ezighị gị ka i kwuo na anyị ekwesighị ịga biri nʼIjipt,