Jeremiah 44:14 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
ọ gaghi-adi kwa onye-nb͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu ndi Juda fọduru gēnwe, bú ndi bataworo n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, ọbuná ilaghachi n'ala Juda, nke ha onwe-ha nāchọ si-ike ilaghachi ibi n'ebe ahu: n'ihi na ọ dighi onye gālaghachi ma-ọbughi ndi b͕apuru ab͕apu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O nweghị onye ọbụla nʼime ndị Juda ahụ fọdụrụ, ndị gara biri nʼIjipt nke ga-agbanarị ọnwụ. Ọ bụ ezie na ọ na-agụsị ha agụụ ike ịlọghachi nʼala Juda, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-alọghachi, karịakwa mmadụ ole na ole ndị ga-agbapụ agbapụ.”