Jeremiah 44:25 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si: Unu onwe-unu na ndinyom-unu ji ọnu-unu ekwu okwu, ọ bu kwa aka-unu ka unu jiworo mezu ya, si, Ayi aghaghi ime nkwa nile ayi nke ayi kweworo, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu: menu ka nkwa nile unu guzosie ike n'ezie, me-kwa-nu ihe nile unu kwere na nkwa n'ezie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu na ndị nwunye unu esitela nʼomume unu gosi na unu na-emezu ihe ndị ahụ unu ji ọnụ kwuo sị, ‘Anyị aghaghị imezu nkwa niile anyị kwere banyere ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nke ihe ọṅụṅụ nye Eze nwanyị mbara Eluigwe.’ “Gaanụ nʼihu mezuo nkwa unu kwere! Mezuokwanụ iyi unu ṅụrụ.