Jeremiah 44:27 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Le, Mu nāmu anya n'aru ha ime ha ihe ọjọ, ọ bughi ime ha nma: agēme kwa ka ndi Juda nile, bú ndi nọ n'ala Ijipt, gwusia site na mma-agha na site n'oké unwu, rue mb͕e ha gāgwusi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na anya m na-ele ha abụghị maka ime ha mma, kama ọ bụ maka ime ha ihe ọjọọ. Ndị Juu niile bi nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼoke ụnwụ, tutu ruo mgbe e bibichara ha dum.