Jeremiah 44:28 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ndi b͕apuworo na mma-agha gēsi n'ala Ijipt laghachi n'ala Juda, ndikom ole-na-ole; ndi Juda nile fọduru, bú ndi biaruworo ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, ewe mara onye okwu-ya gēguzosi ike, nkem, ma-ọbu nke ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Naanị mmadụ ole na ole ga-esi Ijipt gbalata Juda ịgbanarị mma agha. Mgbe ahụ ndị Juda niile fọdụrụ, bụ ndị bịara biri nʼIjipt, ga-amata onye okwu ya na-eguzosi ike, maọbụ nke m, maọbụ nke ha.