Jeremiah 45:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma gi onwe-gi, ì nāchọrọ onwe-gi ihe uku? achọla ha: n'ihi na, le, M'gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi anu-aru nile, bú madu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ma M'gēnye gi ndu-gi ka ọ buru ihe-nkwata n'ebe nile i gēje.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma gị onwe gị, ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? Achọkwala ha. Nʼihi na, lee, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị mmadụ niile, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ma aga m eme ka ị jiri ndụ gị gbapụ jee ebe ọbụla ị ga-eje. ’ ”