Jeremiah 46:10 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma ubọchi ahu diri Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀, ka O we bọ̀rọ Onwe-ya ndi nēmegide Ya ọ́bọ̀: mma-agha gēripia kwa, afọ eju kwa ya, ọ gāṅuju kwa ọbara-ha afọ: n'ihi na àjà ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere n'ala Ugwu n'akuku osimiri Yufretis.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ụbọchị ahụ dịrị Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ọ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ ya, ụbọchị ọ ga-abọrọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya. Mma agha ga-eripịa ha tutu afọ eju ya, e, tutu ruo mgbe ọ ṅụjuru ọbara afọ. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-achụ aja nʼala ahụ dị nʼugwu, nke dị nso osimiri Yufretis.