Jeremiah 48:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēzigara ya ndi nērulata ite manya-vine, ha ewe rulata ya; ọ bu kwa ihe manya-vine ya nile ka ha gāb͕apu, ọ bu kwa ite nile ha ka ha gātupia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite, ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile.