Jeremiah 48:18 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Si na nsọpuru-gi rida, nọdu ala n'akpiri-ikpọ-nku, gi ada nke bi na Dibon; n'ihi na onye nāpunara Moab ihe-ya arigowo imegide gi, o biliwo ebe-gi nile ewusiri ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Sitenụ nʼebe nsọpụrụ unu dị elu rịdata, bịa nọdụnụ nʼala kpọrọ nkụ, unu ndị bi nʼobodo bụ Ada Dibọn. Nʼihi na onye ahụ bibiri Moab ga-abịa ibu agha megide unu, ọ ga-alakwa obodo unu niile e wusiri ike nʼiyi.