Jeremiah 48:32 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ákwá nke kariri ákwá Jeza ka m'gākwara gi, gi osisi vine nke Sibma: alaka-gi nile gabigara oké osimiri, ọbuná n'oké osimiri nke Jeza ka ha ruru: n'elu nghọkọta-nkpuru-gi na n'elu nghọrọ-nkpuru-vine-gi ka onye nke nāpunara madu ihe daworo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Akwa nke karịrị akwa Jeza ka m ga-akwa nʼihi gị, gị osisi vaịnị dị na Sibma. Alaka gị gbasara ruo nʼakụkụ osimiri, e, ha gbasara ruo nʼosimiri Jeza. Ma onye mbibi abịakwasịla mkpụrụ gị niile chara acha, e, ọ bịakwasịla mkpụrụ vaịnị gị niile.