Jeremiah 48:44 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Onye ahu nke nāb͕apu n'iru oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'òlùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na M'gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼoge ahụ, onye ọbụla gbapụrụ ọsọ site nʼihe oke egwu ga-adaba nʼolulu. Onye ọbụla ga-esikwa nʼolulu rịpụta ka igbudu ga-ejide. Nʼihi na aga m eme ka afọ ahụ a kara aka maka ịta Moab ahụhụ bịakwasị ya,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.