Jeremiah 48:45 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'okpuru ndò Heshbon ka ndi nāb͕alaga guzoworo nēnweghi ike: n'ihi na ọku esiwo na Heshbon pua, na ire-ọku site n'etiti Saihon, o we ripia akuku Moab, na opu-n'isi nke umu nkpọtu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼokpuru ndo Heshbọn ka ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ guzoro, na-enweghị onye inyeaka. Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn rere na-aga; ire ọkụ dị ukwuu esitela nʼetiti Saịhọn na-apụ, na-erepịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ahụ ji oke ụzụ na-anya isi.