Jeremiah 49:24 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Damaskọs aghọwọ onye-ume-ngwu, o lewo anya n'azu ib͕alaga, ọma-jijiji ejidewo kwa ya: nkpà na ihe-nb͕u di iche iche ejidesiwo kwa ya ike, dika nke nwanyi ime nēme.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Damaskọs aghọọla onye ike gwụrụ. Ọ tụgharịala ịgbapụ ọsọ, ma ọma jijiji ejidela ya. Oke obi ụfụ na ihe mgbu ejidesiela ya aka ike, dịka obi ụfụ na ihe mgbu nke na-ejide nwanyị ime na-eme.