Jeremiah 49:36 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
M'gēme kwa ka ifufe anọ si na nsọtu anọ nke elu-igwe biakute Ilam, M'gēfesa kwa ha nye ifufe nile ndia; ọ gaghi-adi kwa mba ọ bula ebe ndi Ilam achugara achuga nāgaghi-abà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m esite nʼakụkụ anọ nke mbara eluigwe zite oke ifufe anọ, nke ga-abịa megide Elam. Aga m efesa ha nye oke ifufe anọ ndị a, ndị ga-ebufu ha buga ha na mba niile dị iche iche, ọ dịghị obodo a na-agaghị ahụ ndị Ilam a dọtara nʼagha.