Jeremiah 49:37 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
M'gēme kwa ka Ilam tua ujọ n'iru ndi-iro-ha na n'iru ndi nāchọ ndu-ha: M'gēme kwa ka ihe ọjọ biakwasi ha, bú iwe di ọku nkem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēziga kwa mma-agha n'azu ha, rue mb͕e M'mere ka ha gwusia:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m etipịa Elam nʼihu ndị iro ha, e, nʼihu ndị ahụ na-achọsi ndụ ya ike. Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ha, meekwa ka oke iwe m dị ọkụ bịakwasị ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m mere ka ha niile gwụsịa.