Jeremiah 5:14 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ji si otú a, N'ihi unu nēkwu okwu a, le, anameme okwum nke di n'ọnu-gi ka ha ghọ ọku, anameme kwa ka ndi ghọ nkú, ọ gērichapu kwa ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi ihe ndị a niile, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼihi na okwu ndị a esitela nʼọnụ ndị a pụta, aga m eme ka okwu m, nke si gị nʼọnụ na-apụta, ghọọ ọkụ. Aga m emekwa ka ndị a ghọọ nkụ ọkụ ahụ ga-erepịa.