Jeremiah 5:17 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha gērichapu kwa owuwe-ihe-ubi-gi, na nri-gi, nke umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri: ha gērichapu ìgwè ewu na aturu-gi na ìgwè ehi-gi: ha gērichapu osisi vine gi na osisi fig i: ha gēji mma-agha titu obodo-gi nile ewusiri ike, nke gi onwe-gi nātukwasi ha obi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere. Ha ga-ebibi ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị. Ha ga-ebibi igwe ewu na atụrụ unu, na igwe ehi unu. Ha ga-ebibikwa osisi vaịnị na osisi fiig unu. Ọ bụ mma agha ha ka ha ga-eji bibie obodo unu niile e wusiri ike, bụ obodo ndị ahụ niile unu na-atụkwasị uche.