Jeremiah 50:15 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Kpọnu nkpu-agha megide ya buruburu; o kweyewo ekweye; ihe-nkwagide-ya nile adawo, etikpọwo kwa mb͕idi-ya nile: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu: bọ̀nu ya ọ́bọ̀; dika ọ meworo, menu ya otú a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile! Ọ chiliela aka ya elu. Lee, ụlọ elu ya e wusiri ike adaala, a kwatuokwala mgbidi ya niile. Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị na-abọrọ onwe ya ọbọ nʼahụ Babilọn, bọọnụ ya ọbọ. Meenụ ya dịka o si mee ndị ọzọ.