Jeremiah 50:29 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Menu ka ndi-ọb͕a-uta nuru izukọ imegide Babilon, bú ndi nile nāzọ uta ukwu ikwe ya; manu ulo-ikwū-unu imegide ya buruburu; ya ghara inwe ndi b͕apuru ab͕apu: kwughachinu ya ugwọ dika ọlu-ya si di; dika ihe nile si di nke o meworo, menu ya otú a: n'ihi na Jehova ka o meworo nganga megide, megide Onye Nsọ nke Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Kpọkọtanụ ndị na-agba ụta maka imegide Babilọn, bụ ndị niile na-agba ụta. Maanụ ụlọ ikwu, gbaa ya gburugburu; unu ekwela ka onye ọbụla si nʼime ya gbapụ. Kwụghachi ya ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, dịka ihe niile ahụ o mere si dị meenụ ya otu ahụ. Nʼihi na o buliela onwe ya elu megide Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nke Izrel.