Jeremiah 50:3 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na otù mba esiwo n'Ugwu rigoputa imegide ya, mba ahu gēme ka ala-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ dighi kwa onye ganēbi nime ya: ma madu ma anumanu, ha awaghariwo, la.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu mba, nke si nʼakụkụ ugwu, ga-ebuso ya agha, mee ala ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya, nʼihi na mmadụ na anụmanụ ga-esi nʼime ya gbalaga.