Jeremiah 50:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), umu Israel gābia, ha onwe-ha na umu Juda n'otù; ha ganēje ije nākwa ákwá, ọ bu kwa Jehova, bú Chineke-ha, ka ha gāchọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ndị Izrel na ndị Juda ga-ejikọta onwe ha nʼotu. Ha niile ga-eji anya mmiri pụọ ịchọ Onyenwe anyị Chineke ha.