Jeremiah 50:9 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na, le, Mu onwem gaje ikpọte me ka nkpọkọta mba uku di iche iche si n'ala Ugwu rigoputa imegide Babilon: ha gēdo kwa onwe-ha n'usoro megide ya; agēsi n'ebe ahu were ya: àkú nke usu ahu gādi ka nke dike nke bu ọ̀kà-uta; ọ gaghi-alaghachi azu n'efu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu, ndị ga-ejikọta onwe ha ibuso Babilọn agha. Ha ga-edo onwe ha nʼusoro imegide ya; ọ bụkwa nʼakụkụ ugwu ka ha ga-esi dọta ya nʼagha. Àkụ ha ga-agba ga-adị ka àkụ nke onye bụ dike nʼagha na onye ọka ịgba ụta na-agba. Ha agaghị agba aka lọta.