Jeremiah 51:56 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
n'ihi na onye nāpunara ya ihe-ya ab͕iakwasiwo obodo ahu, bú Babilon, ejidewo kwa ndi-dike-ya, ab͕ajisiwo uta nile ha: n'ihi na Chineke nke nēmeso madu otú ha si eme ka Jehova bu, Ọ ghaghi ikwughachi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye mbibi ga-ebuso Babilọn agha. A ga-adọta ndị bụ dike ya nʼagha, gbajisiekwa ụta ha niile. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke onye na-akwụghachi; ọ ga-akwụghachikwa nʼuju ya.