Jeremiah 52:22 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Isi nke di n'elu ya bu kwa ọla; idi-elu otù isi ahu di cubit ise; ihe-ọkpukpa na pomegranate di kwa n'isi ahu buruburu, ha nile bu ọla: ihe dika ndia ka ogidi nke-abua nwe-kwa-ra, ha na pomegranate.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Isi bronz nke e kpụkwasịrị nʼotu ogidi dị mita abụọ na ụma atọ nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya.