Jeremiah 6:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ha gātutukọsi ndi Israel fọduru dika esi atutukọ nkpuru-vine fọduru: seghachi aka-gi dika ọghọ-nkpuru-vine n'elu alaka nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Ka ha tụtụkọtasịa ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel nke ọma, dịka e si atụtụkọta mkpụrụ niile dị nʼosisi vaịnị; werenụ aka chọgharịa nʼalaka niile, dịka onye ọghọ mkpụrụ vaịnị si eme.”