Jeremiah 8:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ha gāb͕asa ha n'anyanwu, na n'ọnwa, na n'usu nile nke ihe elu-igwe, nke ha huworo n'anya, nke ha fèwo-kwa-ra, nke ha jesowo-kwa-ra, nke ha chọwo-kwa-ra, nke ha kpọwo-kwa-ra isi ala nye: agaghi-achikọta ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu nke di n'iru ala ka ha gāghọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi.