Job 42:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Umu-nne-ya ndikom nile, na umu-nne-ya ndinyom nile, na ndi nile mara ya na mb͕e gara aga, we biakute ya, so ya rie nri n'ulo-ya: ha we gosi ya ebere ha ji n'aru ya, kasi kwa ya obi bayere ihe ọjọ ahu nile nke Jehova mere ka ọ biakwasi ya: ha we nye ya, nwoke ọ bula otù iberibe ego, na nwoke ọ bula otù nb͕a-aka ọla-edo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ụmụnne ya ndị ikom na ụmụnne ya ndị inyom, na ndị enyi ya niile bịara soro ya rie oriri nʼụlọ ya, na-akasị ya obi nʼihi iru ụjụ ya niile. Ha kasịkwara ya obi nʼihi ọnwụnwa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya. Ha niile nʼotu nʼotu nyere ya onyinye ọlaọcha na mgbaaka ọlaedo.