Joel 2:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ka ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, kwa ákwá n'etiti uzọ-nbata-Ya na ebe-ichu-àjà-Ya, si, Jehova, mere ndi-Gi ebere, arara-kwa-la ihe-nketa-Gi nye n'ita-uta, Ka mba nile ọzọ we ghara ichi ha: n'ìhi gini ka ha gāsi n'etiti ndi nile dí iche iche, Òle ebe Chineke-ha nọ?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ”