Joel 2:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Dika olu ọtutu ub͕ọ-ala n'elu ugwu ka ha nāmali amali, dika olu ire-ọku nke nēripia ahihia-ọka, dika otù ndi nke nwere ume nke edoworo n'usoro agha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala na-arịgo elu ugwu. Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ. Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha.