Joel 3:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M'mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M'gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n'isi-unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere.