John 1:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
A mụghị ndị a kweere na ya site nꞌọmụmụ nke anụ ahụ, ma ọ bụ site nꞌọchịchọ nwoke, ma ọ bụ site na ntụpụta mmadụ, kama ịmụ ọzọ a sitere na Chineke nꞌonwe ya.
Igbo 2006
ndi amuru, ọ bughi site n'ọbara, ọ bughi kwa site n'ọchichọ anu-aru, ọ bughi kwa site n'ọchichọ nwoke, kama site na Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke.