John 1:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ndị nchụaja ahụ jụrụ Jọn ajụjụ ọzọ sị ya, “Onye kwanụ ka ị bụ? Ị̀ bụ Ịlaịja?” Jọn zara ha sị, “É,è, abụghị m Ịlaịja.” Ha jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ị̀ bụ onye amụma ahụ Mosisi gwara anyị ihe banyere ya?” Jọn zakwara sị ha, “Ọ dịghị! Abụghị m onye amụma ahụ unu na-ekwu ihe banyere ya.”
Igbo 2006
Ha we jua ya, si, Ì bu gini kwa? Gì onwe-gi bu Elaija? Ọ si, Abughi m. Gì onwe-gi bu onye-amuma ahu? O we za, si, É-è.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Ị bụkwanụ onye? Ị bụ Ịlaịja?” Ọ zara sị ha, “Abụghị m ya.” “Ị bụ Onye amụma ahụ?” “Mba.”