John 1:30 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Onye a bụ onye ahụ m gwara unu ihe banyere ya. Chetanụ na m gwara unu sị, ‘Nꞌoge na-adịghị anya otu onye dị ukwuu karịa m ga-abịa. Ya onwe ya bukwa ụzọ dịrị. Ọ na-adịkwa ruo mgbe nile ebighị ebi.’
Igbo 2006
Onye a bu Onye mu onwem kwuru okwu bayere Ya, si, Otù Nwoke nābia n'azum Onye ghọworo Onye burum uzọ: n'ihi na Ọ buri Onye mbu n'ebe m'nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ onye a ka m kwuru okwu ya mgbe ahụ m sịrị, ‘otu nwoke na-abịa nʼazụ m, onye dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’