John 1:33 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ma amaghị m onye nwoke a bụ. Kama Chineke, onye zitere m ime ndị mmadụ baptizim ebe a, gwara m sị, ‘Onye ahụ Mmụọ Nsọ ga-ebekwasị nꞌisi, bụ onye ahụ unu na-ele anya ya. Ọ bụkwa onye ndị mmadụ ga-esite nꞌaka ya nata Mmụọ Nsọ.’
Igbo 2006
Mu onwem amaghi kwa Ya: ma Onye ziterem ka m'were miri me baptism, Onye ahu sirim, Onye ọ bula i gāhu Mọ Nsọ ka Ọ nēfedakwasi Ya, nānọgide kwa n'aru Ya, Onye ahu bu Onye nēji Mọ Nsọ eme baptism.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mụ onwe m amabughị ya, ma onye ahụ zitere m ka m jiri mmiri mee baptizim kwuru, ‘Onye ahụ ị ga-ahụ, onye Mmụọ Nsọ ga-ebekwasị, ma nọgidekwa, ọ bụ ya ga-eji Mmụọ Nsọ mee baptizim.’