John 1:39 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs sịrị ha, “Bịanụ ka unu hụrụ.” Nꞌotu oge ahụ, ha sooro Jisọs gaa nꞌebe o bi. Ha sooro ya nọgide nꞌebe ahụ nꞌụbọchị ahụ, nꞌihi na ọ bụ ihe dị ka elekere anọ nke anyasị ka ha jiri zute ya nꞌụbọchị ahụ.
Igbo 2006
Ọ si ha, Bianu, unu gāhu kwa. Ya mere ha biara hu ebe O biri; ha na Ya we nọgide ubọchi ahu; ọ di ka oge hour nke-iri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ha, “Bịanụ, unu ga-ahụ.” Ha sooro ya ga hụ ebe ọ na-anọ. Ha nọnyekwara ya ụbọchị ahụ niile. Ọ bụ nʼihe dị ka elekere anọ nke mgbede.