John 1:42 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O duuru Pita bịarute nꞌebe Jisọs nọ. Mgbe Jisọs hụrụ Pita, o legidesịrị ya anya ike gwa ya okwu sị ya, “Ọ bụ ezie na aha gị bụ Saimọn nwa Jọn ma site taa gaa nꞌihu, aha ọhụrụ gị bụ Pita, nke pụtara Nkume!”
Igbo 2006
O duru ya biakute Jisus. Jisus lere ya anya, si, Gi onwe-gi bu Saimon nwa Jọn: agākpọ gi onwe-gi Kifas (nke bu Pita, ma asugharia ya).
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ kpọtaara ya Jisọs. O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita).