John 10:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Onye e goro ọrụ adịghị elezi atụrụ anya. Ọ hụ nkịta ọhịa ka ọ na-abịa, ọ na-agbapụ ọsọ, hapụ atụrụ ahụ ka nkịta ọhịa buru ha, ma ọ bụ chụsasịa ha.
Igbo 2006
Onye-ọlu egoro ego, nke nābughi kwa onye-ọzùzù-aturu, onye aturu nābughi nke aka ya, ọ nāhu agu ka ọ nābia, o we rapu aturu, b͕alaga, agu we nwude ha, chusa kwa ha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye e goro ọrụ, nke na-abụghị onye nche atụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, ọ na-ahapụ ha gbaa ọsọ mgbe ọ hụrụ agụ ka ọ na-abịa; mgbe ahụ agụ na-achụso atụrụ ahụ chụsasịa ha.