John 10:33 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị Juu zara ya sị, “Anyị achọghị ịtụ gị nkume nꞌihi ọrụ ọma ị rụrụ. Kama anyị chọrọ ịtụ gị nkume nꞌihi na gị, bụ mmadụ efu, na-eme onwe gị dị ka Chineke.”
Igbo 2006
Ndi-Ju zara Ya, si, Ọ bughi n'ihi ọlu ọma ka ayi nātu Gi nkume, kama ọ bu n'ihi nkwulu; n'ihi kwa na Gi onwe-gi, ebe I bu madu, I nēme Onwe-gi Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị Juu zara ya, “Anyị achọghị ịtụ gị nkume nʼihi ọrụ ọma ndị a, kama nʼihi nkwulu na nʼihi na gị bụ mmadụ efu, ma ị na-eme onwe gị Chineke.”