John 10:38 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ọ bụrụ na m na-arụ ọrụ Chineke, nabatanụ ọrụ m dị ka ama zuru oke, ma unu jụ ịnara m. Ọ bụrụ na unu anabata ọrụ m, unu ga-amata, kwerekwa na Nna m nọ nꞌime m, na mụ onwe m nọkwa nꞌime Nna m.”
Igbo 2006
Ma ọ buru na aluam ha, ọbuná ma asi na unu ekweghi Mu onwem, nēkwerenu ọlum: ka unu we mara nāmagide kwa na Nnam di nimem, na Mu onwem di kwa nime Nnam.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na m na-arụ ya, a sịkwarị na unu ekweghị na m, kwerenụ nʼọrụ ndị a, ka unu nwee ike mata ma ghọtakwa na Nna ahụ nọ nʼime m, mụ onwe m nọkwa nʼime Nna ahụ.”