John 11:39 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs nyere iwu sị, “Bupụnụ nkume a!” Ma Mata, nwanne nwanyị Lazarọs sịrị, “Ozu ya ebidola isi isi ugbu a, nꞌihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.”
Igbo 2006
Jisus si, Wepunu nkume ahu. Mata, nwa-nne-nwanyi nke onye ahu nwuruwori, si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ nēsì ísì ub͕u a: n'ihi na nka mere ya ubọchi anọ ọ nwuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị, “Bupunụ nkume ahụ!” Ma Mata, nwanne nwanyị onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ ga na-esi isi ugbu a, nʼihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.”