John 11:44 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Lazarọs pụtara. E jiri akwa ozu kekọtaa aka ya na ụkwụ ya. E jikwa akwa ozu kee ihu ya. Jisọs nyere ha iwu sị, “Tọpụnụ ya ka ọ laa!”
Igbo 2006
Onye nwururi anwu putara, ewerewori ákwà-ozu ke ya ukwu na aka; were kwa ichafọ kechie ya iru. Jisus si ha, Tọpunu ya, ghara kwa ya ka ọ la.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ahụ nwụrụ anwụ pụtara, e jikwa akwa ozu kekọta aka ya na ụkwụ ya, werekwa akwa ịchafu kechie ihu ya. Jisọs sịrị ha, “Tọpụnụ ya, hapụ ya ka ọ laa.”