John 11:56 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ha rutere Jerusalem, ha malitere ịchọ Jisọs. Ha na-ajụrịta onwe ha ajụjụ mgbe ha nọ nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ sị, “Gịnị ka i chere? Ọ̀ ga-abụ na ọ gaghị abịa na mmemme a?”
Igbo 2006
Ya mere ha nāchọ Jisus, we nēkwurita n'etiti onwe-ha, mb͕e ha guzoro n'ulo uku Chineke, si, Gini ka unu nēchè? Nà Ọ gaghi-abia n'ememe a ma-ọli?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha na-achọ Jisọs na-ajụrịta onwe ha nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, “Gịnị ka unu chere? Ọ bụ na ọ gaghị abịa na mmemme a?”